Nnyocha amalitela maka ugbọelu EnuguAir gbabara ọhịa n'ọdọụgbọelu Bini

Nnyocha amalitela maka ugbọelu EnuguAir gbabara ọhịa n'ọdọụgbọelu Bini
Mgbe e biputara ya

Nnyocha amalitela ugbua maka ugbọelu Enugu Air gbabara ọhịa n'ọdụ-ụgbọelu Benin

Akụkọ pụtara n’ụbọchị Tọzde 23 Julaị 2026 bụ na Ụgbọelu EnuguAir nwere ihe mberede, nke mere o jiri gbabaa n’ọhịa.

Mana ekele dịrị chukwu na mmadụ anwụghị maọbụ merụọ ahụ.

Ọ bụ gini mere? Gini kpatara nsogbu ụgbọelu ahụ nwere?

Dịka ozi ndị ụlọ ọrụ na achịkọba EnuguAir wepụtara siri kọwaa, ihe mberede ahụ mere oge ụgbọelu Ahụ si legọsụ aga Benin nwere ihe bekee kpọrọ “Runway Excursion” ka ụgbọelu ahụ dara na Runway. Ozi mbụ kwuru na ọ bụ “Incursion”

Kedụ nke mere EnuguAir? Ọ bụ “Runway Excursion” ka ọ bụ “Runway Incursion” kedụ ihe dị iche?

Ị sị na ụgbọelu nwere Runway Excursion pụtara na ụgbọrlu nwere “Runway Overun” ma ọ bụ “Runway Veer-off. Overun bụ na ụgbọalu akwụsịghịị rue n’isi uzọ-ụgbọelu nke mere ka ọkpọnye isi m’ọhịa. Ebe “Runway Veer-off bụ na enwere ihe kpatara ụgbọelu ahụ jiri gbapụ na okporo ụzọ-ụgbọelu gbaba ọhịa.

Onye ji ọkwa CEO EnuguAir bụ Capt Tolu Ita kelere ndị ọrụ agha, ndị ọrụ ọdụ ụgbọelu na ndị niile nyeere ha aka. O kwuru na obi dị ya ụtọ na mmadụ anwụghị.

Gini bụ Runway Incursion?

Nke a pụtara na e nwere ihe nọchiri ụzọ ụgbọelu si agba elu ya maọbụ ada nke nwere ike ibute nnukwu ihe mberede. Incursion nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọkwọ ụgbọelu malitere nyawa n’enwetaghị “Air Traffic Clearance” sị ya na nsogbu adịghị.

Onye ji ụkwụ ma ọ bụ ugbọala inọchị ụzọ ụgbọelu ma ọ bụ ụgbọelu ịda ebe ụgbọelu ọzọ kwụ na ya.

N’ime Excursion na Incursion, kedụ nke mere? Makana otu akwụkwọ ozi ndị EnuguAir weputara kwuru “Incursion” ebe ọzọ kwuru “Excursion”.

CEO Enugwu Air bụ Capt Tolu Ita kwuru na ọ bụ runway Excursion mere EnuguAir jiri nwee ihe mberede ahụ ụbọchị tọzdee 23rd July 2026.

Ita kwuru na ihe kpatara Excursion ahụ bụ Hydroplanning nke pụtara na mmiri dọọrọ na ya bụ Runway soro kpata nsogbu ahụ.

Ita kwuru na ọbụghị “Plane Crash” na ọbụghịkwanụ “Emergency Landing” wee kwuo na nnyocha ndị otu ụgbọelu ụwa niile amalitela ịchọpụta ihe merenụ.

Ka ọ dị ugbua, gọmenti Naijiria agbachiela ọdụ ụgbọelu Benin ganye na nyocha achọpụta ebe mmiri siri baa n’opi ụgbọgụrụ..