Akụkọ dị mkpa - Julaị 23, 2026
Akụkọ dị mkpa - Julaị 23, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja atụọla mmadụ atọ mkpọro ọka maka ịtọrọ ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi n'okpuru ọchịchị ime obodo Oriire dị n'Ọyọ Steeti.
- Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Fraịde 10 Julaị 2026 ka ndị nchekwa napụtara ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi ahụ ndị ojiegbe tọọrọ n'ọnwa Mee 2026.
- Ndị uweojii n'Abia steeti ekwuola na ha ga-achọpụta ihe gburu Onyekachi Nnabugwu, nwunye ya dị ime na ụmụ ya atọ n'obodo Umuimo dị n'okporuọchị ime obodo Osisioma Ngwa, n'Abịa Steeti.
- Ndị agbataobi Nnabugwu gwara BBC na ọ gafere ụbọchị atọ ha na-ahụghị nwoke ahụ na ndị ezinaụlọ ya, tupu ha achọpụta na ha anwụọla n'ime ụlọ ha.
- Kọmitii nchereoge nke Ụlọomeiwu Nnọchiteanya akpọọla oku ka Onye Ndụmọdụ Nchekwa Naịjirịa bụ Nuhu Ribadu na Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba ofesi bụ Bianca Ojukwu bịa nye nkọwa gbasara ihe ha maara maka ngalaba Presidential Foreign Investment Promotion Council (PFIPC).
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






