You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa - Julaị 24, 2026
Akụkọ dị mkpa - Julaị 24, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Onyeisiala Bola Tinubu akwadola iguzobe ngalaba ndịagha ọhụrụ anọ iji mgbasawanye ngalaba ndịagha site na asatọ ruo iri na abụọ ma kwadokwa inye mmadụ puku iri abụọ na asatọ ọhụrụ ọrụ dịka ndịagha Naịjirịa.
- Ozi ụlọọrụ onyeisiala wepụtara kwuru na ngalaba ọhụrụ ndị a ga-ahụ maka nchekwa na steeti gụnyere Benue, Nasarawa, Kogi, Kwara, Niger, Taraba, Adamawa, Edo, Delta, na Bayelsa bụ ebe ndị otu nnupụisi jihadist na ndị ntọrọ mmadụ na-enye nsogbu.
- Isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha na-achọ otu onye ọrụ ha maka ebubo itinye aka n'ire si ndị omekome na ndị na-enyi ọha egwu uwe ndịagha n'ụzọ iwu na-akwadoghị.
- Ozi ụlọọrụ ahụ wepụtara kwuru na nnyocha mbụ gosiri na nwoke ahụ aha ya bụ Private Mohammed Yusuf Amutu na-arụ n'ebe a na-arụpụta uwe ndịagha, riri mbumbu ọsọ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Juun 2026.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.