Kachi Nnabugwu: Etu e si hụ ozu nwaanyị dị ime, di ya na ụmụ ha atọ n'ụlọ ha n'Abịa steeti

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu nwoke a na-akpọ Kachi Nnabugwu, nwunye a sị dị ime na ụmụ ya atọ nwụrụ n'otu ụbọchị n'ọnọdụ edobeghị anya n' obodo Umuimo dị n'okpuruọchịchị Osisioma Ngwa, n'Abịa steeti.

Ndị agbataobi gwara BBC na a chọpụtara na ha anwụọla n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Julaị 2026.

Otu onye ezinaụlọ ahụ a kpọrọ 'Chiamaka' gwara BBC na ọ bụ mgbe ha nọrọ ihe dịka abalị abụọ na ha ahụghị Kachi na nwunye ya mere ha ji bido na-achọ ebe ha nọ.

Ọ kọwara na mgbe ha ruru ebe Kachi rụrụ ụlọ ka ha chọpụtara na ya, nwunye ya na ụmụ ya atọ anwụọla.

Onye ọzọ bụ Nwokoma Ọkwandụ kwuru na o mebeghị ihe karịrị ọnwa isii Onyekachi kwatara n'obodo ahụ tupu ha anwụọ.

Ọ kọwara ọnwụ ezinaụlọ ahụ dịka ihe mgbawa obi.

Etu mmadụ ise n'otu ezinaụlọ si nwụọ n'otu ụbọchị n'Abia steeti

Obodo a na-akpọ Umuimo dị n'okpuru ọchịchị Osisioma Ngwa, n'Abịa steeti nọ n'ihe mgbu dịka mmadụ ise si otu ezịnaụlọ nwụrụ n'otu ụbọchị n'ụzọ edobeghị anya.

Ndị agbataobi ha kwuru na ọ bụ na Julaị 18, bụ ụbọchị ikpeazụ ha hụrụ ndị ezinaụlọ ahụ.

Otu onye nọ ebe ihe mere gwara BBC okwu kwuru na a hụrụ na e si n'ime were kpochie ụzọ tupu ahụ ahụ ha n'ozu.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ihe mere kwuru na ndị uweojii abịala buru ozu ndị ahụ dịka nnyocha na-amalite.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị uweojii Abịa steeti gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere eme.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Maureen Chinaka kwuru n'ekwentị na ha nwetara ozi banyere ọdachi ahụ a, ma kwe nkwa inye anyị ozi zuru oke banyere ihe mere ma ọ nata ikike ime nke a.

Maureen Desmond Chinaka sịrị, "Ọ bụ eziokwu. Anyị nwetara ozi banyere ihe mere".

Chinaka gara n'ihu kwuo na ozi banyere ihe mere ga-apụta n'oge n'adịghị anya.