Ihe niile i kwesịrị ịma gbasara asọmpi Wafcon 2026

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Ugo eberela na mgbabu ka asọmpi Iko Mba Afrịka Maka Bọọlụ Ụmụnwaanyị (WAFCON) 2026 ga-amalite taa bụ Sọnde, 26 Julaị na mba Moroko.

Otu na-ahu maka bọọlu na mba Afrika bụ CAF haziriburu ka e mee ya n'etiti 17 Maachị na 3 Eprel, mana ha mechara yigharịa ya ụbọchị iri na abụọ tupu ọ malite, n'ihi ihe ha kpọrọ "ọnọdụ ndị a na-atụghị anya ha."

Asọmpi a ga-amalite mgbe otu bọọlu umunwaanyi mba Algeria ga-ezute Senegal n'egwuregwu mmeghe na Rabat.

WAFCON nke afọ a ga-enwe otu iri na isii, egwuregwu 34, ma gwụchaa na 16 Ọgọọst.

Asọmpi a dịkwa mkpa n'ihi na ọ bụkwa ụzọ ịhọpụta ndị ga-eru Iko Ụwa FIFA Maka Ụmụnwaanyị 2027.

Otu anọ ga-eru n'agba nke anọ ga-enweta tiketi ozugbo gaa Brazil, ebe otu anọ ndi na-abatahi n'agba nke anọ ga-asọ mpi maka tiketi abụọ ọzọ ga-enye ha ohere ịsonye gba Iko mbaụwa FIFA.

Kedu egwuregwu ndị dị mkpa? Olee usoro asọmpi a? Ebee ka a ga-agba ya?

BBC News Igbo achịkọtala ihe niile ị ga-achọ ịma gbasara asọmpi bọọlụ ụmụnwaanyị kachasị ukwuu n'Afrịka.

Otu ndị so n'asọmpi

E kewara mba iri na isii sonyere n'asọmpi ahụ n'ime anọ.

Otu A: Moroko (n), Algeria, Senegal, Kenya.

Otu B: Saut Afrịka, Côte d'Ivoire, Burkina Faso, Tanzania.

Otu CH: Naịjirịa (ndị na-agbachitere iko), Zambia, Egypt, Malawi.

Otu D: Gana, Cameroon, Mali, Cape Verde.

Mba Moroko ga-ezute Algeria, Senegal na Kenya n'Otu A.

Otu egwu bọọlu Naịjirịa bụ Super Falcons, ga-achọ imeri iko ahụ nke ugboro 11. Ha nọ n'otu Ch ha na Zambia, Egypt na Malawi.

Mba Saut Afrịka, ndị meriri asọmpi 2022, nọ n'otu B, ebe Ghana so Cameroon, Mali na Cape Verde n'otu D.

Mba abụọ kacha mee ọfuma n'otu ọ bụla ga-eru agba nke asatọ (quarter-finals).

Usoro asọmpi Wafcon 2026 na oge ha ga-amalite

Ịmaaka niile ga-amalite n'elekere ise nke mgbede (17:00 GMT) na elekere asatọ nke abalị (20:00 GMT), ma e wezụga egwuregwu ikpeazụ.

Agba nke asatọ (Quarter-finals): 8 na 9 Ọgọọst

Agba nke anọ (Semi-finals): 12 Ọgọọst

Ịmaaka ikpeazụ (Final): Sọnde, 16 Ọgọọst, n'elekere asaa nke mgbede (19:00 GMT).

Ebee ka a ga-agba WAFCON 2026?

A ga-egwu asọmpi WAFCON 2026 n'ama egwuregwu ise dị na obodo abụọ na Moroko: Rabat na Casablanca.

Na mbụ, e bu n'obi ka obodo Fes nabata egwuregwu Otu D, mana e bugara ha na Casablanca.

Ama egwuregwu atọ dị na Rabat bụkwa ebe e jiri mee ụfọdụ egwuregwu AFCON 2025, ka Moroko na-akwado ịnabata Iko Ụwa FIFA 2030 ya na mba ndị ọzọ.

Moroko, ga-agba bọọlu ha na Moulay Hassan Stadium, ebe ahu ka aga anọkwa gba Agba nke asatọ, na Agba nke anọ.

Ekpebibeghị ama a ga-anọ gbaa asompi ikpeazụ. Mana ọ ga-adị n'etiti Moulay Hassan Stadium na Prince Moulay Abdellah Stadium, ha abụọ dị na Rabat.

Ama egwuregwu ise e kwadoro bụ:

  • Moulay Hassan Stadium, Rabat
  • Olympic Stadium, Rabat
  • Al Medina Stadium, Rabat
  • Larbi Zaouli Stadium, Casablanca
  • Moulay Rachid Stadium, Casablanca

Kedu mba ndị kachasị amasị ndị mmadụ?

N'ime mba iri na isii sonyere na WAFCON 2026, ọ bụ naanị Naịjirịa na Saut Afrịka bulịri iko ahụ.

Super Falcons bụ ndị bụlịri iko asompi gara aga, ma bụrụkwa ndị kacha elu n'ọkwa bọọlụ ụmụnwaanyị n'Afrịka.

Onye nche goolu ha bụ Chiamaka Nnadozie, emeriela ihe nrite onye nche goolu kacha mma n'Afrịka afọ atọ n'usoro, ebe onyeisi otu, Rasheedat Ajibade, bụ onye kacha pụta ihe n'asọmpi ikpeazụ.

Morocco, bụ ndị nnabata asọmpi, erutela n'agba ikpeazụ ugboro abụọ gara aga mana ha emeribeghị iko ahụ. Ugbu a, onye nchịkwa ha bụ Jorge Vilda, onye duru Spain merie Iko Ụwa Ụmụnwaanyị n'afọ 2023.

Saụt Afrịka, ndị meriri WAFCON na 2022, na Gana, bụ ndị gbatara ogogo nke atọ n'asọmpi ikpeazụ, sokwa n'etiti ndị a na-atụ anya ha ga-asọ mpi siri ike.

Zambia nwekwara ike ime ihe ịtụnanya, karịsịa n'ihi onyeisi otu ha, Barbra Banda, onye meriri ihe nrite BBC Women's Footballer of the Year 2024.

N'agbanyeghị nke a, ọ ga-esiri mba ndị ọzọ ike ịsọ mpi maka iko ahụ.

Ogogo nke otu n'asọmpi Wafcon 2026

Oge mmalite niile bụ GMT

Sọnde, 26 Julaị

Otu A: Algeria v Senegal – 17:00

Otu A: Morocco v Kenya – 20:00

Mọnde, 27 Julaị

Otu B: South Africa v Tanzania – 17:00

Otu B: Côte d'Ivoire v Burkina Faso – 20:00

Tuzde, 28 Julaị

Otu CH: Zambia v Egypt – 17:00

Otu CH: Nigeria v Malawi – 20:00

Wenezde, 29 Julaị

Otu D: Ghana v Cape Verde – 17:00

Otu D: Cameroon v Mali – 20:00

Tọzde, 30 Julaị

Otu A: Senegal v Kenya – 17:00

Otu A: Morocco v Algeria – 20:00

Fraịde, 31 Julaị

Otu B: South Africa v Côte d'Ivoire – 17:00

Otu B: Burkina Faso v Tanzania – 20:00

Satọde, 1 Ọgọọst

Otu CH: Egypt v Malawi – 17:00

Otu CH: Nigeria v Zambia – 20:00

Sọnde, 2 Ọgọọst

Otu D: Ghana v Cameroon – 17:00

Otu D: Mali v Cape Verde – 20:00

Mọnde, 3 Ọgọọst

Otu A: Senegal v Morocco – 20:00

Otu A: Kenya v Algeria – 20:00

Tuzde, 4 Ọgọọst

Otu B: Burkina Faso v South Africa – 20:00

Otu B: Tanzania v Côte d'Ivoire – 20:00

Wenezde, 5 Ọgọọst

Otu CH: Egypt v Nigeria – 20:00

Otu CH: Malawi v Zambia – 20:00

Tọzde, 6 Ọgọọst

Otu D: Mali v Ghana – 20:00

Otu D: Cape Verde v Cameroon – 20:00

Wafcon 2026 agba nke asatọ

Satọde, 8 Ọgọọst

QF2: Onye meriri Ìgwè B v Onye gụchara nke abụọ na Ìgwè A – 17:00

QF1: Onye meriri Ìgwè A v Onye gụchara nke abụọ na Ìgwè B – 20:00

Sọnde, 9 Ọgọọst

QF4: Onye meriri Ìgwè D v Onye gụchara nke abụọ na Ìgwè C – 17:00

QF3: Onye meriri Ìgwè C v Onye gụchara nke abụọ na Ìgwè D – 20:00

Wafcon 2026 agba nke anọ

Wenezde, 12 Ọgọọst

SF2: Onye meriri QF2 v Onye meriri QF3 – 17:00

SF1: Onye meriri QF1 v Onye meriri QF4 – 20:00

Ịmaaka ntozuoke maka Iko Ụwa Ụmụnwaanyị 2027

Tọzde, 13 Ọgọọst

Onye meriri emeri na QF2 v Onye meriri emeri na QF3 – 17:00

Onye meriri emeri na QF1 v Onye meriri emeri na QF4 – 20:00

Ịmaaka maka onye nke atọ

Satọde, 15 Ọgọọst

Onye meriri na SF1 v Onye meriri na SF2 – 17:00

Ịmaaka ikpazụ na Wafcon 2026

Sọnde, 16 Ọgọọst

Onye meriri SF1 v Onye meriri SF2 – 19:00 GMT